Obu gịnị ka mmelu iji kpụrụ m n onu 
Obu gịnị ka mmelu iji kpo mụ asị 
Okwa mụ na gị bu nwanne, onye jebe okporo ibe ya 
Onye iro bịa we tinye ọ gbaghara 
Na mụ na gị bụ nwanne, onye ri be onye tu ibe ya 
Na ọkwa nwanne ozu na awụ ozu arụ (aje!) 
Agbụ gba na me eeh he, na mụ na nwanne m edozi go 
  Agbụ gba na me eeh eh eh eh he 
Na mụ na nwanne m edozi go 
Iwe gị dị ọkụ dajụọ (ọ dị na obi mụọ oh!) 
Onulu ube, onulu ube, onulu ube nwanne agbana oso 
  Onulu ube, onulu ube, onulu ube nwanne agbana oso 
  Ákwá nwanne yi ná ebe, ona e mekwa gi na obi? (hey ya ah!) 
  Izuu ka mma na nneji ka ịma lụ, ma ná ina agba nwanne gị ama 
Nkà ari rịa aga eri zi ọ nwe fa (mba nụ) 
Igbo n'ile bu nwanne, onye jebe odulu ibe ya 
Chukwu ekwe na ndị iro mụọ anyi amụ 
Na mụ na gị bụ nwanne, onye ri be onye tu ibe ya 
Na ọkwa nwanne ozu na awụ ozu arụ 
Agbụ gba na me eeh he, na mụ na nwanne m edozi go 
(Igbo unu ana a nụkwa ọnụ mụ o. Unu ana anụ?) 
Agbụ gba na me eeh eh eh eh he, na mụ na nwanne m edozi go 
Iwe gị dị ọkụ dajụọ biko! (ọ dị na obi mụọ oh!) 
Onulu ube, onulu ube, onulu ube nwanne agbana oso 
  Onulu ube na mụ na yi bu nwanne o 
(Onulu ube nwanne agbana oso) 
Iwe nwanne eru na ọkpụkpụ ife m melu gi gbahara o 
(Onulu ube nwanne agbana oso) 
Nwanne maru nwanne na mbọ si nwanne oyi ana a 
(Onulu ube nwanne agbana oso) 
Aye e mama ina anụ ka ogene m na aha 
(Onulu ube nwanne agbana oso) 
Ayee e ugo eze na o mu na ekwu 
(Onulu ube nwanne agbana oso) 
Maka nwanne amaka dọọ 
Na nwanne amaka dọọ 
(Onulu ube nwanne agbana oso) 
Maka nwanne amaka dọọ 
Na nwanne amaka 
(Onulu ube nwanne agbana oso) 
Agbụ gba na me eeh he, na mụ na nwanne m edozi go 
Na mụ na yi bu nwanne 
Agbụ gba na me eeh eh eh eh he, na mụ na nwanne m edozi go 
Iwe gị dị ọkụ dajụọ biko! (ọ dị na obi mụọ oh!) 
Onulu ube, onulu ube, onulu ube nwanne agbana oso!